Native Bible

1 Kings 2:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja.

1 Kings 2:25 in English

1 Kings 2:25 · Berean Standard Bible

So King Solomon sent the order to Benaiah son of Jehoiada, who struck down Adonijah, and he died.

Context

23Mgbe ahụ, eze Solomọn ji Onyenwe anyị ṅụọ iyi sị, “Ka Chineke mesoo m mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na Adonaịja ejighị ndụ ya kwụọ ụgwọ nʼihi arịrịọ a. 24Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.” 25Eze Solomọn zigara Benaya nwa Jehoiada ka ọ gaa gbuo Adonaịja. Benaya gakwara tigbuo Adonaịja. 26Eze kpọkwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Laghachi azụ nʼubi gị nʼAnatot.* I kwesiri ịnwụ ọnwụ ma ọ bụghị ugbu a ka a ga-egbu gị nʼihi na i buru igbe ọgbụgba ndụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nʼoge nna m Devid dị ndụ. I sokwa ya hụọ ahụhụ nʼoge ahụ niile o nwere nsogbu.” 27Ya mere, Solomọn chụpụrụ Abịata* ka ọ ghara ịbụ onye nchụaja Onyenwe anyị ọzọ. Otu a ka o si mezuo* bụ okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru banyere ezinaụlọ Elayị na Shaịlo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.