Native Bible

1 Kings 16:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?

1 Kings 16:27 in English

1 Kings 16:27 · Berean Standard Bible

As for the rest of the acts of Omri, along with his accomplishments and the might he exercised, are they not written in the Book of the Chronicles of the Kings of Israel?

Context

25Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ. 26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha. 27Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 28Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 29Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.