1 Ndị Eze 16:28
1 Kings 16:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1 Kings 16:28 in English
1 Kings 16:28 · Berean Standard Bible
And Omri rested with his fathers and was buried in Samaria, and his son Ahab reigned in his place.
Context
26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha. 27Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 28Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 29Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria. 30Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.