1 Ndị Eze 16:15
1 Kings 16:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.
1 Kings 16:15 in English
1 Kings 16:15 · Berean Standard Bible
In the twenty-seventh year of Asa’s reign over Judah, Zimri reigned in Tirzah for seven days. Now the troops were encamped against Gibbethon of the Philistines,
Context
13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru. 14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel? 15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha. 16Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile. 17Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.