1 Ndị Eze 16:17
1 Kings 16:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.
1 Kings 16:17 in English
1 Kings 16:17 · Berean Standard Bible
Then Omri and all the Israelites marched up from Gibbethon and besieged Tirzah.
Context
15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha. 16Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile. 17Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha. 18Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ, 19nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.