1 Ndị Eze 16:13
1 Kings 16:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.
1 Kings 16:13 in English
1 Kings 16:13 · Berean Standard Bible
This happened because of all the sins Baasha and his son Elah had committed and had caused Israel to commit, provoking the LORD, the God of Israel, to anger with their worthless idols.
Context
11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile. 12Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu. 13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru. 14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel? 15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.