1 Ndị Eze 16:12
1 Kings 16:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu.
1 Kings 16:12 in English
1 Kings 16:12 · Berean Standard Bible
So Zimri destroyed the entire household of Baasha, according to the word that the LORD had spoken against Baasha through Jehu the prophet.
Context
10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya. 11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile. 12Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu. 13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru. 14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.