1 Ndị Eze 15:24
1 Kings 15:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
1 Kings 15:24 in English
1 Kings 15:24 · Berean Standard Bible
And Asa rested with his fathers and was buried with them in the city of his father David, and his son Jehoshaphat reigned in his place.
Context
22Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa. 23Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi. 24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 25Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.