1 Ndị Eze 15:26
1 Kings 15:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie.
1 Kings 15:26 in English
1 Kings 15:26 · Berean Standard Bible
And he did evil in the sight of the LORD and walked in the way of his father and in his sin, which he had caused Israel to commit.
Context
24Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 25Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie. 27Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya. 28Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.