Native Bible

1 Kings 14:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.

1 Kings 14:15 in English

1 Kings 14:15 · Berean Standard Bible

For the LORD will strike Israel as a reed is shaken in the water. He will uproot Israel from this good land that He gave their fathers, and He will scatter them beyond the Euphrates,* because they have made their Asherah poles, provoking the LORD to anger.

Context

13Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma. 14“Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa! 15Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera. 16Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.” 17Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.