Native Bible

1 Kings 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha.

1 Kings 14:17 in English

1 Kings 14:17 · Berean Standard Bible

Then Jeroboam’s wife got up and departed for Tirzah, and as soon as she stepped over the threshold of the house, the boy died.

Context

15Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera. 16Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.” 17Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. 18Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma. 19Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.