1 Ndị Eze 14:13
1 Kings 14:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.
1 Kings 14:13 in English
1 Kings 14:13 · Berean Standard Bible
All Israel will mourn for him and bury him. For this is the only one belonging to Jeroboam who will receive a proper burial,* because only in him has the LORD, the God of Israel, found any good in the house of Jeroboam.
Context
11Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’ 12“Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ. 13Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma. 14“Ma Onyenwe anyị ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa! 15Onyenwe anyị ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe Onyenwe anyị site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.