1 Ndị Eze 14:11
1 Kings 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’
1 Kings 14:11 in English
1 Kings 14:11 · Berean Standard Bible
Anyone belonging to Jeroboam who dies in the city will be eaten by dogs, and anyone who dies in the field will be eaten by the birds of the air.’ For the LORD has spoken.
Context
9* Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị. 10“ ‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile. 11Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. Onyenwe anyị ekwuola ya.’ 12“Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ. 13Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.