Native Bible

1 Kings 13:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.

1 Kings 13:10 in English

1 Kings 13:10 · Berean Standard Bible

So the man of God went another way and did not return by the way he had come to Bethel.

Context

8Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a. 9Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ” 10Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel. 11Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze. 12Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.