Native Bible

1 Kings 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.

1 Kings 13:12 in English

1 Kings 13:12 · Berean Standard Bible

“Which way did he go?” their father asked. And his sons showed him * the way taken by the man of God, who had come from Judah.

Context

10Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel. 11Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze. 12Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara. 13Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. 14Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?” Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.