Native Bible

1 Kings 13:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ”

1 Kings 13:9 in English

1 Kings 13:9 · Berean Standard Bible

For this is what I was commanded by the word of the LORD: ‘You must not eat bread or drink water or return by the way you came.’”

Context

7Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.” 8Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a. 9Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ” 10Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel. 11Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.