Native Bible

1 Kings 12:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe.

1 Kings 12:30 in English

1 Kings 12:30 · Berean Standard Bible

And this thing became a sin; the people walked as far as Dan to worship before one of the calves.*

Context

28Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” 29Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan. 30Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe. 31Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile,* nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị. 32O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.