Native Bible

1 Kings 12:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.”

1 Kings 12:28 in English

1 Kings 12:28 · Berean Standard Bible

After seeking advice, the king made two golden calves and said to the people,* “Going up to Jerusalem is too much for you. Here, O Israel, are your gods, who brought you up out of the land of Egypt.”

Context

26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.” 28Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.” 29Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan. 30Ihe a ghọrọ mmehie dịrị ha, nʼihi na ndị mmadụ na-abịa kpọọ isiala nye nke dị na Betel ma gaakwa ebe dị anya, dịka Dan, nʼihi ife ehi ọlaedo nke dị nʼebe ahụ ofufe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.