1 Ndị Eze 12:26
1 Kings 12:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid.
1 Kings 12:26 in English
1 Kings 12:26 · Berean Standard Bible
Jeroboam said in his heart, “Now the kingdom might revert to the house of David.
Context
24Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 25Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.* 26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.” 28Mgbe ọ natachara ndụmọdụ, eze kpụrụ ụmụ ehi ọlaedo abụọ. Ọ sịrị ndị mmadụ, “Ọ bụ oke ọrụ nye unu ịgbago Jerusalem. Leenụ chi unu, ndị Izrel, ndị sitere nʼIjipt kpọpụta unu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.