1 Ndị Eze 12:25
1 Kings 12:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.*
1 Kings 12:25 in English
1 Kings 12:25 · Berean Standard Bible
Then Jeroboam built Shechem in the hill country of Ephraim and lived there. And from there he went out and built Penuel.*
Context
23“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha, 24Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu. 25Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.* 26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid. 27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.