Native Bible

1 Kings 11:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek,* bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

1 Kings 11:5 in English

1 Kings 11:5 · Berean Standard Bible

Solomon followed Ashtoreth the goddess of the Sidonians and Milcom * the abomination of the Ammonites.

Context

3Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. 4Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. 5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek,* bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. 6Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya. 7Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem,* Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.