1 Ndị Eze 11:3
1 Kings 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.
1 Kings 11:3 in English
1 Kings 11:3 · Berean Standard Bible
He had seven hundred wives of royal birth and three hundred concubines—and his wives turned his heart away.
Context
1Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het. 2Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya. 3Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. 4Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. 5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek,* bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.