1 Ndị Eze 1:17
1 Kings 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.
1 Kings 1:17 in English
1 Kings 1:17 · Berean Standard Bible
“My lord,” she replied, “you yourself swore to your maidservant by the LORD your God: ‘Surely your son Solomon will reign after me, and he will sit on my throne.’
Context
15Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya. 16Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze.
Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?” 17Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị. 18Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a. 19O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.