1 Ndị Eze 1:18
1 Kings 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a.
1 Kings 1:18 in English
1 Kings 1:18 · Berean Standard Bible
But now, behold, Adonijah has become king, and you, my lord the king, did not know it.
Context
16Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze.
Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?” 17Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị. 18Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a. 19O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị. 20Ma ugbu a, onyenwe m eze, ndị Izrel niile na-ele gị anya isi nʼọnụ gị nụta onye ga-anọchi anya gị, ịnọkwasị nʼocheeze eze gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.