Native Bible

1 Kings 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.

1 Kings 1:15 in English

1 Kings 1:15 · Berean Standard Bible

So Bathsheba went to see the king in his bedroom. Since the king was very old, Abishag the Shunammite was serving him.

Context

13Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’ 14Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.” 15Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya. 16Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?” 17Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.