1 Jọn 2:16
1 John 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa.
1 John 2:16 in English
1 John 2:16 · Berean Standard Bible
For all that is in the world—the desires of the flesh, the desires of the eyes, and the pride of life—is not from the Father but from the world.
Context
14Ana m edere unu ụmụntakịrị,
nʼihi na unu maara nna ahụ.
Ana m edere unu ndị nna,
nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.
Ana m edere unu ụmụ okorobịa,
nʼihi na unu siri ike,
okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu,
unu emeriekwala ajọ onye ahụ. 15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. 16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. 17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 18Ụmụ m, nke a bụ oge awa nke ikpeazụ. Dịka unu nụrụ na otu onye na-emegide Kraịst na-abịa, ọ bụladị ugbu a, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst abịala. Otu a ka anyị si amata na ọ bụ oge awa nke ikpeazụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.