1 Jọn 2:15
1 John 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.
1 John 2:15 in English
1 John 2:15 · Berean Standard Bible
Do not love the world or anything in the world. If anyone loves the world, the love of the Father is not in him.
Context
13Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a,
nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.
Ana m edere unu ụmụ okorobịa,
nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ. 14Ana m edere unu ụmụntakịrị,
nʼihi na unu maara nna ahụ.
Ana m edere unu ndị nna,
nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ.
Ana m edere unu ụmụ okorobịa,
nʼihi na unu siri ike,
okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu,
unu emeriekwala ajọ onye ahụ. 15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya. 16Nʼihi na ihe niile dị nʼụwa, ihe ndị ahụ niile anụ ahụ anyị, na anya anyị na-achọ, ya na ịnya isi mmadụ banyere ihe ọ bụ na ihe o nwere, esiteghị nʼebe Nna nọ, kama ha sitere nʼụwa. 17Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.