Native Bible

1 Corinthians 7:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a.

1 Corinthians 7:26 in English

1 Corinthians 7:26 · Berean Standard Bible

Because of the present * crisis, I think it is good for a man to remain as he is.

Context

24Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke. 25Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi. 26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a. 27Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ. 28Ma ọ bụrụ na i kpebie nʼobi gị ịlụ nwunye, i meghị mmehie ọbụla; ọ bụrụkwa na nwaagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe ọtụtụ nsogbu nʼime ụwa. Ọ ga-amasị m igbochiri unu nsogbu ndị ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.