1 Ndị Kọrint 7:25
1 Corinthians 7:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi.
1 Corinthians 7:25 in English
1 Corinthians 7:25 · Berean Standard Bible
Now about virgins, I have no command from the Lord, but I give a judgment as one who by the Lord’s mercy is trustworthy.
Context
23Akwụọla ụgwọ isi unu, unu abụkwala ohu mmadụ ọzọ. 24Ụmụnna m, nʼọnọdụ ọbụla mmadụ nọ mgbe a kpọrọ ya, ya nọgidesie ike nʼime Chineke. 25Ihe banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Enweghị m iwu ọbụla site nʼaka Onyenwe anyị banyere ajụjụ a, ma aga m ekwu uche nke aka m dịka onye sitere nʼebere nke Onyenwe anyị kwesiri ntụkwasị obi. 26Echere m na ọ ka mma ugbu a, nʼihi nsogbu nke na-abịanụ ka onye ọbụla nọdụrụ onwe ya dịka o siri nọrọ ugbu a. 27Ị lụọla nwanyị? Achọla nkewa. Ọ bụ na ị lụbeghị nwanyị? Ejela ịchọ onye ị ga-alụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.