1 Ndị Kọrint 7:19
1 Corinthians 7:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke.
1 Corinthians 7:19 in English
1 Corinthians 7:19 · Berean Standard Bible
Circumcision is nothing and uncircumcision is nothing. Keeping God’s commandments is what counts.
Context
17Ka onye ọbụla bie ndụ ya dịka amara Onyenwe anyị nyere ya si dị, nakwa nʼọnọdụ nke Chineke kpọrọ ya. Nke a bụ iwu m na-enye nʼụlọ chọọchị niile. 18Akpọrọ onye ọbụla mgbe e biri ya ugwu? Ya achọla iwepụ akara obibi ugwu ya. Ka onye a na-ebighị ugwu tupu ọkpụkpọ ya hapụ inye onwe ya nsogbu ịchọ ụzọ a ga-esi bie ya ugwu. 19Nʼihi na ọ dịghị mkpa ma e biri gị ugwu ma e bighị gị ugwu. Ihe kachasị mkpa bụ idebe iwu Chineke. 20Ka onye ọbụla nọgide dịka ọ dị mgbe a kpọrọ ya. 21Ị bụ ohu mgbe a kpọrọ gị? Echegbula onwe gị nʼihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, were ohere ahụ mee ihe ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.