1 Ndị Kọrint 2:8
1 Corinthians 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe.
1 Corinthians 2:8 in English
1 Corinthians 2:8 · Berean Standard Bible
None of the rulers of this age understood it. For if they had, they would not have crucified the Lord of glory.
Context
6Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. 7Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. 8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. 9Ma dịka e dere ya,
“Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị,
ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị,
ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya,
bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”* 10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya.
Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.