1 Ndị Kọrint 2:10
1 Corinthians 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi.
1 Corinthians 2:10 in English
1 Corinthians 2:10 · Berean Standard Bible
But God has revealed it to us by the Spirit. The Spirit searches all things, even the deep things of God.
Context
8O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. 9Ma dịka e dere ya,
“Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị,
ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị,
ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya,
bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”* 10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya.
Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi. 11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke. 12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.