Native Bible

1 Corinthians 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke.

1 Corinthians 2:11 in English

1 Corinthians 2:11 · Berean Standard Bible

For who among men knows the thoughts of man except his own spirit within him? So too, no one knows the thoughts of God except the Spirit of God.

Context

9Ma dịka e dere ya, “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ntị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nʼobi ya, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị niile hụrụ ya nʼanya.”* 10Ma Chineke e kpugherela anyị ihe omimi ndị a site na Mmụọ Nsọ ya. Mmụọ Nsọ bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo niile dị Chineke nʼobi. 11Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nʼobi ya. Ọ bụ naanị mmụọ nọ nʼime onye ahụ bụ onye mara ihe niile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nʼobi ya, ma ọ bụghị naanị Mmụọ nke Chineke. 12Ma mmụọ nke anyị natara abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ nke sitere na Chineke, ka anyị nwee ike ịghọta onyinye amara niile Chineke nyere anyị. 13Nke a bụ ihe anyị na-ekwu, ọ bụghị nʼokwu a kuziiri anyị site nʼamamihe mmadụ, kama site nʼokwu nke Mmụọ kuziri anyị; anyị ji okwu nke Mmụọ na-akọwa eziokwu nke mmụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.