Native Bible

1 Corinthians 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme.

1 Corinthians 15:4 in English

1 Corinthians 15:4 · Berean Standard Bible

that He was buried, that He was raised on the third day according to the Scriptures,

Context

2E si nʼoziọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu niile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nʼihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka. 3Ihe m nyefere unu nʼaka na mbụ bụ ozi ahụ m natara ị debe, nke dị oke mkpa, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie anyị, dịka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ. 4Na e liri ya, ma e mere ka o si nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ, dịka akwụkwọ nsọ kwukwara na ọ ga-eme. 5O gosiri Sefas* onwe ya, emesịa, ndị ozi iri na abụọ ahụ hụkwara ya. 6Emesịakwa, o gosiri ihe karịrị narị mmadụ ise nʼime ụmụnna onwe ya, nʼotu mgbe, ọtụtụ nʼime ndị ahụ ka nọ ndụ taa, ọ bụ ezie na ụfọdụ nʼime ha adaala nʼụra ọnwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.