1 Ndị Kọrint 11:9
1 Corinthians 11:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.
1 Corinthians 11:9 in English
1 Corinthians 11:9 · Berean Standard Bible
Neither was man created for woman, but woman for man.
Context
7Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke. 8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. 9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke. 10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi. 11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.