Native Bible

1 Corinthians 11:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke.

1 Corinthians 11:7 in English

1 Corinthians 11:7 · Berean Standard Bible

A man ought not to cover his head, since he is the image and glory of God; but the woman is the glory of man.

Context

5Ma nwanyị ọbụla na-ekpe ekpere maọbụ na-ebu amụma, ma o kpuchighị isi ya, na-emenye isi ya ihe ihere, nʼihi na ọ dịka nwanyị kpụchara isi ya. 6Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla achọghị ikechi isi ya, ya kpụchaa ya. A sịkwa na ọ bụkwanụ ihe ihere na nwanyị kpụchara isi ya, ka nwanyị kechie isi ya. 7Ma nwoke ekwesighị ikpuchi isi ya, nʼihi na nwoke bụ onyinyo na otuto nke Chineke, ebe nwanyị bụ otuto nke nwoke. 8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. 9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.