Native Bible

1 Corinthians 11:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi.

1 Corinthians 11:10 in English

1 Corinthians 11:10 · Berean Standard Bible

For this reason a woman ought to have a sign of authority on * her head, because of the angels.

Context

8E si na nwoke kee nwanyị, ma e sighị na nwanyị kee nwoke. 9E keghị nwoke maka nwanyị, ma e kere nwanyị maka nwoke. 10Nʼihi nke a, nwanyị kwesiri ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nʼokpuru di ya, maka ndị mmụọ ozi. 11Ma otu ihe si dị nʼime ndụ anyị na-adị nʼime Onyenwe anyị, nwoke adịghị ma e wepụ nwanyị, nwanyị adịghịkwa ma e wepụ nwoke. 12Nʼihi na dịka nwanyị siri na nwoke pụta na mbụ, otu a ka a na-esitekwa nʼahụ nwanyị mụpụta nwoke. Ma ha niile si nʼaka Chineke pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.