Native Bible

1 Corinthians 10:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke.

1 Corinthians 10:31 in English

1 Corinthians 10:31 · Berean Standard Bible

So whether you eat or drink or whatever you do, do it all to the glory of God.

Context

29Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe? 30Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya? 31Ihe ọbụla ị na-eme, ma unu na-eri ihe maọbụ na-aṅụ ihe, na-emenụ ha niile maka otuto nke Chineke. 32Unu emejọla ndị Juu maọbụ ndị Griik, ma ọ bụkwanụ nzukọ Chineke. 33Na-agbalịsinụ ike ime dịka m si eme. Nʼihe ọbụla m na-eme, ana m ejisi ike ime ihe ga-atọ onye ọbụla ụtọ. Anaghị m achọ ọdịmma nke m naanị, kama ọ bụ ọdịmma nke mmadụ ibe m, ime ka a zọpụta ha. 10:7 Ọpụ 32:6 10:14 Ụfọdụ na-akpọ ya Oriri nsọ. 10:20 Maọbụ, mmụọ ọjọọ 10:26 Abụ 24:1

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.