1 Ndị Kọrint 10:26
1 Corinthians 10:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”*
1 Corinthians 10:26 in English
1 Corinthians 10:26 · Berean Standard Bible
for, “The earth is the Lord’s, and the fullness thereof.”*
Context
24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ. 25Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche. 26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”* 27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche. 28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.