1 Ndị Kọrint 10:25
1 Corinthians 10:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
1 Corinthians 10:25 in English
1 Corinthians 10:25 · Berean Standard Bible
Eat anything sold in the meat market without raising questions of conscience,
Context
23Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka. 24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ. 25Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche. 26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”* 27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.