1 Ndị Kọrint 10:12
1 Corinthians 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda.
1 Corinthians 10:12 in English
1 Corinthians 10:12 · Berean Standard Bible
So the one who thinks he is standing firm should be careful not to fall.
Context
10Ka anyị hapụkwa itamu ntamu dịka ụfọdụ ha mere ma bụrụ ndị Mmụọ ozi ọnwụ tigburu. 11Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. 12Ya mere, ọ bụrụ na ị na-eche na ị guzosiri ike, lezie anya ka ị ghara ịda. 13O nweghị ọnwụnwa ọbụla nwara unu nke abịakwutebeghị mmadụ. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, ọ gaghị ekwe ka a nwaa unu karịa ike unu. Kama mgbe a na-anwa unu, ọ ga-enye unu ike imeri ọnwụnwa ma gosikwa unu ụzọ mgbapụ nʼime ya. 14Ya mere, ndị enyi m hụrụ nʼanya, gbaaranụ ikpere arụsị ọsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.