1 Ihe E Mere 9:18
1 Chronicles 9:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.
1 Chronicles 9:18 in English
1 Chronicles 9:18 · Berean Standard Bible
he was previously stationed at the King’s Gate on the east side. These were the gatekeepers from the camp of the Levites.
Context
16Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun;
na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa. 17Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị:
Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha. 18Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị. 19Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche. 20Finehaz nwa Elieza bụ onyeisi ndị mbụ rụrụ ọrụ a na mgbe ochie, Onyenwe anyị nọnyekwaara ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.