1 Ihe E Mere 9:17
1 Chronicles 9:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
1 Chronicles 9:17 in English
1 Chronicles 9:17 · Berean Standard Bible
These were the gatekeepers: Shallum, Akkub, Talmon, Ahiman, and their relatives. Shallum was their chief;
Context
15Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf; 16Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun;
na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa. 17Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị:
Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha. 18Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị. 19Shalum bụ nwa Kore, na nwa nwa Ebiasaf na Kora. Ya na ụmụnna ya ka ọ bụ ọrụ ha ilekọta ebe a na-eje ozi, na ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu ahụ dịka nna nna ha lekọtara, cheekwa ụlọ nzute Onyenwe anyị nche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.