Native Bible

1 Chronicles 6:61 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.

1 Chronicles 6:61 in English

1 Chronicles 6:61 · Berean Standard Bible

To the rest of the Kohathites, ten cities were allotted from the half-tribe of Manasseh.

Context

59na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. 60Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ. 61E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase. 62E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase. 63E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.