Native Bible

1 Chronicles 6:62 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase.

1 Chronicles 6:62 in English

1 Chronicles 6:62 · Berean Standard Bible

The Gershomites *, according to their clans, were allotted thirteen cities from the tribes of Issachar, Asher, Naphtali, and Manasseh in Bashan.

Context

60Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ. 61E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase. 62E fekwara nza nye agbụrụ niile dị nʼikwu Geshọm obodo iri na atọ na Bashan, site nʼala ebo Isaka, na Asha, na Naftalị, na agbụrụ niile dị nʼikwu Manase. 63E fekwara nza nye ikwu Merari obodo iri na abụọ site nʼala ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn. 64Otu a ka ndị Izrel si nye ndị Livayị obodo ndị a na ebe ịta nri nke anụ ụlọ dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.