1 Ihe E Mere 4:10
1 Chronicles 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ.
1 Chronicles 4:10 in English
1 Chronicles 4:10 · Berean Standard Bible
And Jabez called out to the God of Israel, “If only You would bless me and enlarge my territory! May Your hand be with me and keep me from harm, so that I will be free from pain.” And God granted the request of Jabez.
Context
8na Koz, onye bụ nna Anub na Hazobeba, nakwa nke ikwu Ahahel, nwa Harum. 9Jabez bụ nwoke a na-asọpụrụ karịa ụmụnne ya ndị ikom niile. Nne ya kpọrọ aha ya Jabez, sị, “A mụrụ m ya nʼihe mgbu.” 10Jabez tikuru Chineke Izrel mkpu akwa sị ya, “Biko gọzie m, mee ka oke ala m saa mbara. Kwere ka aka gị dịkwasị m, ma wezuga m site nʼihe mmerụ ahụ ọbụla, ka m si otu a gbanarị ihe mgbu.” Chineke zara ekpere ya meere ya ihe ọ rịọrọ. 11Kelub, nwanne nwoke Shua mụrụ Mehia, nna Eshton, 12Eshton mụrụ Bet-Raafa, na Pasea, na Tihina. Tihina mụrụ Ir Nahash. Ndị a niile bụ ndị ikwu Reka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.