Native Bible

1 Chronicles 28:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo.

1 Chronicles 28:17 in English

1 Chronicles 28:17 · Berean Standard Bible

the weight of the pure gold for the forks, sprinkling bowls, and pitchers; the weight of each gold dish; the weight of each silver bowl;

Context

15Ọ wepụtara ọlaedo nke e ji akpụ iheọkụ na ihe ịdọba iheọkụ. Wepụtakwa ọlaọcha ga-ezu ịkpụ oriọna ọlaọcha, na ihe ịdọba ha. 16Ọ wepụtara ọlaedo e ji akpụ tebul achịcha nsọ, na ọlaedo e ji akpụ tebul ndị ọzọ, na ọlaọcha e ji akpụ tebul ọlaọcha. 17Ọ wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ndụdụ e ji adụrụ anụ e ji chụọ aja, efere ịkwọsa mmiri na ite mmiri; ọlaedo zuru nke e ji akpụta efere ọlaedo ọbụla, na ọlaọcha zuru nke e ji akpụta efere ọlaọcha ọbụla, wepụtakwa ọlaọcha na ọlaedo. 18Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 19Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.