1 Ihe E Mere 26:22
1 Chronicles 26:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
1 Chronicles 26:22 in English
1 Chronicles 26:22 · Berean Standard Bible
the sons of Jehieli, Zetham, and his brother Joel. They were in charge of the treasuries of the house of the LORD.
Context
20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke. 21Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli, 22na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 23Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel. 24Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.