Native Bible

1 Chronicles 25:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha.

1 Chronicles 25:2 in English

1 Chronicles 25:2 · Berean Standard Bible

From the sons of Asaph: Zaccur, Joseph, Nethaniah, and Asarelah. These sons of Asaph were under the direction of Asaph, who prophesied under the direction of the king.

Context

1Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a: 2Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf: Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha. 3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya: Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto. 4Ma nye Heman, ụmụ ndị ikom ya: Bukaya, Matanaya, Uziel, Shubuel, Jerimot, Hananaya, Hanani, Eliata, Gidalti, Romamti-Eza, Joshbekasha, Maloti, Hotia, na Mahaziot.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.