1 Ihe E Mere 25:1
1 Chronicles 25:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a:
1 Chronicles 25:1 in English
1 Chronicles 25:1 · Berean Standard Bible
Additionally, David and the commanders of the army set apart some of the sons of Asaph, Heman, and Jeduthun to prophesy with the accompaniment of lyres, harps, and cymbals. The following is the list of the men who performed this service:
Context
1Devid na ndịisi agha ndị Izrel họpụtara ndị ga na-ebu amụma mgbe ndị ji ụbọ akwara, une na ogene na-eti egwu. Ha sitere nʼụmụ Asaf, Heman na Jedutun, họpụta ha. Ndị a bụ aha ndị rụrụ ọrụ nke a: 2Ndị amụma na-ebu amụma, ndị nke bụ ụmụ Asaf:
Zakua, Josef, Netanaya na Asarela bụ ụmụ Asaf nọ nʼokpuru Asaf, onye nọ nʼokpuru eze bụ onyeisi ha. 3Ma nye Jedutun, ụmụ ndị ikom ya:
Gedaliya, Zeri, Jeshaya, Shimei, Hashabaya na Matitaia. Ha dị isii nʼọnụọgụgụ nọrọ nʼokpuru nna ha bụ Jedutun, onye na-ebu amụma, na-eji une na-enye Onyenwe anyị ekele na otuto.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.